Dika enwere Iwu di iche iche n'achi Uwa, otua ka iwu n'achi ime Mo dikwa, nke n'achi onodu gi na Chineke.


1. IWU NKE MBU

CHINEKE HURU Gl N'ANYA, NWEKWA IHE O ZUBERE NYE NDU Gl.
(Ihe nile edeputara agagu nime akwukwo a, aganagu ya site na usoro ihe si nime akwukwo Nso puta. Odi nkpa ka i gua nu ihe o nekwu).

IHU-NANYA NKE CHINEKE
N'ihi na Chineke huru uwa n'tanya otu a, na O nyere obuna Okpara O muru nani Ya, ka onye o bula, nke kwere na Ya, ghara ila n'iyi, kama ka o nwe ndu ebigh-ebi (Jon 3:16).

IHE CHINEKE ZUBERE
(Kraist nekwu si) Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya oke (Jon 10:10)

Gini mere ndi madu enwegh
ndu nke jubigara oke a?


N'ihi na...

2. IWU NKE ABUA

MADU JUPUTARA NA NMEHIE, BURU KWA ONYE EKEWAPURU N'EBE CHINEKE NO, N'IHI NKEA O PUGH IMATA NA INWE IHU N'ANYA CHINEKE NA NZUBE CHINEKE NYE NDU YA.

MADU JUPUTARA NA NMEHIE

"N'ihi na madu nile emehiewo, ha adigh eru kwa otuto Chineke" (Ndi Rom 3:23)

Ekere madu h ya na Chineke nwe nmekorita, ma site na isi ike nke onwe ya, o we n'aga n'uzo nke masiri ya; n'kewa we bata n'etiti ya na Chineke. Echiche uche onwe madu a putara ihe, site n'omume nke nnupu isi na egegh nti, nke n'-eziputa ihe Akwukwo Nso kporo nmehie.

EKEWAPURU MADU N'EBE CHINEKE NO

"N'ihi na ugwo-olu nke nmehie bu onwu", (Nka bu nkewapu nke ime Mo) (Ndi Rom. 6:23)

ibo1

Chineke di Nso ma madu bu onye nmehie. Oke olulu kewara ha. Madu n'agbali site n'ike aka ya ka o rue Chineke nso nw้ kwa ndu nke iubigara oke: ndu oma, omume oma, nzuputa nke echiche, na ihe ndi ozo; ma ihe ndia enwegh iye' aka obula bara uru. Iwu nke ato nyere ayi osisa bayere iha ngbagwoju anya a.


3.IWU NKE ATO

JISUS KRAIST BU N'ANI AJA ACHURU IJI HICHAPU NMEHIE MADU. SITE NA YA KA I PURU IMATA, NWEKWA IHU N'ANYA CHINEKE NA IHE O ZUBERE NYE NDU Gl.

O NWURU N'ONODU AYI

Ma Chineke neme ka ihu n'anya nke aka Ya n'ebe anyi no puta ihe n'ihi na, mgbe ayi no, nabu ndinmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi. Ndi Rom 5:8

O SITERE NA NDI NWURU-ANWU BILIEI

"O ji kwa otutu uzo nadigh igo ago che onwe-ya n'iru ha na ndu mgbe O husiri ahuhu ebe O mera ka ha nahu Ya anya n'ogologo, ogu ubochi abua, O nekwu kwa iha nile bayere ala-eze Chineke".Olu Ndi-Ozi 1 :3

NANI YA BU UZO

"Jisus si ya, 'Mu onwem bu uzo, na ezi-okwu, na ndu; O digh onye o bula nabiakute Nnam, ma-obugh site na Mu'." Jon 14:6

ibo2

Chineke emechiwo olulu ahu nke kewapuru anyi n'ebe O no site n'izite Okpara Ya Jisus Kraist ka O nwua nelu obe n'onodu ayi.

Ozugh oke imata nani Iwu ato ndia...


4. IWU NKE ATO AYI AGHAGH INARA JISUS KRAIST N'OTU N'OTU N'IME OBI AYI, DIKA ONYE NZOPUTA AYI NA ONYE NWE AYI. MGBE AHU KA AYI PURU IMATA, GHOTA KWA IHU N'ANYA CHINEKE NA IHE OZUBERE NYE NDU AYI.

AYI AGHAGH INARA KRAIST

"Ma ka ha ra bu ndi nara Ya, ha ka O nyere ike igho Umu Chineke, bu ndi kwere n'aha-Ya." Jon 1:12

AYI N'ANARA KRAIST SITE N'OKWUKWE

"Nihi na o bu amara ka ejiworo zoputa unu, site n'okwukwe; nka esitegh kwa n'onwe unu: O bu onyinye Chineke; O sitegh n'olu, ka onye o bula we ghara inya isi." Ndi Efesos 2:8,9

AYI N'ANARA KRAIST SITE N'IRIO YA KA OBATA:

(Kraist n'ekwu si) "Le, anameguzo n'onu-uzo n'aku kwa aka: O buru na onye o bula anu olum, meghe kwa uzo M'gabiakute ya" (Nkpughe 3:20). Inara Kraist putara iwere onwe ayi nye Chineke, tukwasi Kraist obi ka O bata nime ndu ayi, ka O gbaghara nmehie nile ayi, me ayi ihe O choro ka ayi buru. O zugh oke bu iji ogugu isi kwere ihe nile O kwuru, ma-obu ime mkpatu n'aru ayi.

Akara gburugburu abua ndia nochiri udi ndu abua.

ibo3

NDU NKE ONWE Gl N'ACHI

E - Onwe gi n'oche eze
- Kraist na ezi
- Ochicho nke onwe gi nachi, nke newete ike -ogwugwu na ida mba

NDU NKE KRAIST N'ACHI

- Kraist n'oche eze ndu
E - Onwe gi ebudara n'ala
- Ochicho gi nke Chineke n'achi itoeto na nkwekorita nke gi na Chineke na nzube Ya.

Ole akara nke i dika Ya?
Ole akara nke i choro ka idi ka ya?


ihe ndia n'akowa otu i puru isi nara Kraist:

I NWERE IKE INARA KRAIST UGBUA SITE N'OKWU-KWE, NKE EKWUPUTARA SITE N'ARIRO EKPERE (Ekpere bu ikwuru Chineke okwu).

Chineke mara obi gi, o bugh okwu onu gi di ya nkpa karia omume nke obi gi. Nka bu ekpere aroputara ka ikpe e:

"Onye nwem Jisus, Odorom aya na ejim akam n'achi ndum, n'ihi nka emehiewom Gi. Anam emeghe onu-uzo nke ndum n'anabata Gi dika onye nzoputam, na onye nwem. Mem udi madu I choro ka m'buru".

Ekpere nke a o neziputa agu u nke obi gi?

O buru otua, kpe ekpere a ugbua; Kraist gabata nime ndu gi, dika O kwere na nkwa.


OTU I GESI MATA NA KRAIST ABATAWO NIME NDU GI

I nabatara Kraist nime obi gi? Dika nkwa Ya si di n'akuwkwo Nkpughe 3:20, ole onodi gi na Kraist no ugbua? Kraist siri na O gabata nime ndu gi. O geduhie gi? Gini nyere gi ike ima na Chineke azawo ekpere gi? (Ikwesi ntukwasi obi nke Chineke N'Onwe Ya, na okwu Ya).

BIBLE NSO N'EKWE ONYE OBULA, NKE NARA KRAIST, NKWA NDU EBIGH-EBI.

"Ama ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebigh-ebi, ndu ahu di nime Okpara Ya. Onye nwere Okpara ahu nwere ndu ahu; onye n'enwegh Okpara Chineke enwegh ndu ahu. Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwo, bu ndi kwere n'aha Okpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebigh-ebi" 1 Jon 5:11-13

Kele Chineke mgbe dum na Kraist no nime ndu gi, na O gagh arapukwa gi ma-oli (Ndi Hibru 13:5). I puru imata na Kraist di ndu n'ebi nime gi; n'ihi nka i nwere ndu ebigh-ebi, site na mgbe ahu i nabatara Ya dika nkwa Ya si di. O gagh eduhie gi. Ole ihe bayere inwe nmetu n'aru?


ATUKWASILA OBI N'INWE NMETU N'ARU

Nkwa nke okwu Chineke, o bugh inwe nmetu n'aru, bu ike ayi. Onye nke Kraist n'adi ndu site n'okwukwe (Ituk-wasi-obi) n'ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke na okwu Ya. Ugbo-ala nka eseputara n'akwukwo a n'akowa ihe bayere Ezi-Okwu (nke bu Chineke na Okwu Ya), Okwukwe (nke bu itukwasi obi ayi nime Chineke, na okwu ya), na imetu n'aru (nke bu, nziputa okwukwe na nrube isi ayi(Jon 14:21).

ibo4

Ugbo-ala nka nwere ike kwopu ma Gad-Van adigh ya. Ma Gad-Van enwegh ike ime ka ugbo kwopu. Otu aka ahu, ndi nke Kraist anagh-adabere na nmetu n'aru, ma-obu ime nkpatu nke aru, kama ayi natukwasi okwukwe ayi (ntuk-wasi-obi) nime ikwesi ntukwasi-obi nke Chineke na nkwa nke okwu Ya.

UGBUA INABATAWORO KRAIST

Malite na mgbe ahu i nabatara Kraist site n'okwukwe, otutu ihe mere, nke bu ihe ndia:

  • Kraist batara nime ndu gi (Nkpughe 3:20)(na Ndi Kolosi 1:27)
  • Agbaghara gi nmehie gi nile (Ndi Kolosi 1:14)
  • I ghoro nwa nke Chineke (Jon 1:12)
  • I malitere na njem ahu nke Chineke ji n'ihi ya ke gi (Jon 10:10; 2 Ndi Korint 5:14, 15, 17).

I nwere ike icheta ihe ozo ka idi ebube na ndu gi, karia i nabata Jisus na ndu gi? I ga acho ikele Chineke n'ekepere ugbua n'ihi ihe oma O mere gi? O mume nke ikele Chineke n'eziputa okwukwe.

Ugbua gini ozo?


IHE GEME KA NWA NKE CHINEKE NETO ETO:

Ito eto n'ime Mo n'esite n'itukwasi Jisus Kraist obi. "Onye ezi omume gesite n'okwukwe di ndu" (Ndi Galetia 3:11). Ndu nke okwukwe g'enyere gi aka iba uba n'itukwasi Chineke obi bayere nkpa gi nile, na ime ihe ndia:

  1. Gakuru Chineke n'ekpere kwa ubochi (Jon 15:7)
  2. Gua Okwu Chineke kwa ubochi (Olu Ndi Ozi 17:11) Malite n'ozi-oma Jon.
  3. Rubere Chineke isi oge obula (Jon 14:21)
  4. Gwa ndi ozo bayere Kraist site na ndu gi na okwu onu gi. (Matiu 4:19; Jon 15:8).
  5. Dabere na Chineke n'ihe obula gbasara ndu gi (I Pita 5:7).
  6. Mo Nso: Kwere ka onachi ndu gi, n'enye gi ike idiri Chineke ndu na igbara ya ama kwa ubochi (Ndi Galetia 5:16, 17;Olu-Ndi-Ozi 1:8).

NMEKORITA NKE UMU-CHINEKE DI NKPA

Na Ndi-Hibru 10:25, agwara ayi k'ayi arapula "Nzuko nke onwe ayi, ka ayi nadusi ndi ozo odu ike" Nku esokotara n'oku nenwu ezi oku, n'enye kwa ihe nke oma; ma oburu na ekewapu ha n'otu n'otu, oku ahu g'anyu. Otua ka nmekorita nke gi na umu nke Chineke ibe gi dikwa. O buru na i digh aga Chochi ebe anekwuputa, n'asopuru Kraist, na Okwu Ya, malite ta ije na Chochi ebe anekwuputa n'asopuru Kraist, na Okwu Ya, malite ta ije na Chochi ebe anekwuputa okwu Chineke, na Kraist, we soro ibe gi ndi choputaworo na Kraist bu onye Nzoputa ha, n'anwaputa kwa ihu n'anya Ya na ndu ha.

Ichoro ka ndi ozo soro gi keta ihe i choputara ohu?


ADDITIONAL ASSISTANCE